Miyetti Allah, ndị uweojii na ndịeze enwela nkwekọrịta

Ichi ehi bụ otu n'ime ọrụ e ji mara ndị sina mpaghara ugwu ala Naịjirịa Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ichi ehi bụ otu n'ime ọrụ e ji mara ndị sina mpaghara ugwu ala Naịjirịa

Ndịuweojii, Miyetti Allah, ndịeze n'akwa ndịọrụugbo ekwekọrịtala na site ugbua gawa n'ihu na a ga-akwụ onye ọrụugbo ọbụla ndịọchị ehi mebiri ubi ya ụgwọ

Mkpebi a bịara n'ime mkparịta ụka ha nwere n'ụlọ ndịuweojii dị n'Imo Steeti nke onye Kọmishịọna ndịuweojii bụ Chris Ezike bụ onyeisioche.

Onyeisi ndị Miyetti Allah bụ Audị diko rịorọ ndị ọrụugbo mgbaghara maka ubi ha ndịoọchị ehi mebiri.

Otu n'ime ndịeze bụ Eze George Eke nke imeobodo Ubomiri dịna Mbaitoli kwuru ka Gọọmenti Etiti kọrọ atụmatụ ihinye ụlọ ehị

Kọmishịona ndị uweojii kwuru na ha ekwughị ihe mgbasara ala ebe a na-achị ehi maka n'ọdị na mkpebi Gọọmenti Etiti.

"mkpebi anyị nwere bụ ka enwe ndị nchekwa taraọchịchị, iji mara mgbe nsogbu pụtara n'ụzọ aga-eji gboo ya."

"Ndịuweojii na ndị ọrụnchekwa dị icheiche ga-agba mbọ ịmata ebe ndị naachị ehi na amaghị ama si a bata karịsịa na mpaghara Okigwe."

"Ha ga-agba kwa mbọ ịhụ n'onye ọbụla dara iwu ga-ata ahụhụ dị n'elu ya."

Ihe ọzọ dịna nkwekọrịta ha bụ n'onye ọrụugbo mọọbụ mmadụ ọbụla gburu ehi, a ga-eleba anya n'ihe gbasara ya, Hụ n'ekpere ikpeziri ezi.

Ọ bụrụ na ekpeịkpe ziriezi, obi ga-adị onye ọbụla nma, ebe udo ga-adịkwa n'obodo.

Isiokwu Ndị Emetụtara