Dịka o si aga na orire na ọzụzụ ndị otu egwuregwu bọọlụ

Ụfọdụ ndị gbapụtara ihe n'egwuregwu bọọlụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị gbapụtara ihe n'egwuregwu bọọlụ

Otu egwuregwu dị icheiche nweburu ụbọchị iri na itoolu iji zụọ onye ọgba bọọlụ ọbụla masịrị ha, mana ugbua ha nweziri elekere olenaole tupu ohere ahụ ọkwakọ ọnụ.

Dịka a ma na ụfọdụ azụmaahịa ndị a apụtala ihe, ọtụtụ ka na-aga n'ihu ugbụa ebe ọtụtụ otu egwuregwu na-atụ anya ịzụ otu mmadụ mọọbụ abụọ.

Akụkọ ndị pụtara ihe bụ n'Aubameyang nwere ike gawa Arsenal mọọbụrụ ha-ere Olivier Giroud dịka otu Chelsea ekwela ọnụ ego dị £15m.

Daniel Sturridge gara West Brom na mbinye.

Ndị otu Tottenham na Paris St. Germain ekwekọrịtala ka Lucas Moura gafe Tottenham n'ọnụ egọ dị £25m mọọbụrụ Lucas na Tottenham kwere n'ọnụ egọ ha ga-akwụ ya n'ụgwọ.

Otu Watford azụọla Gerard Deulofeu nke Barcelona na mbinye dịka onye mbụ ha na-ego kamgbe ha nwetara onye nkuzi ọhụrụ bụ Javi Gracia.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị merela njem site n'otu egwuregwu ga-afe n'ọzọ

A na-atụ anya n'Aymeric Laporte ga-ahapụ Athletico Bilbao gawa Manchester City n'ọnụ ego ruru £57m, dịka ha gakwa okwu Fred nke Shaktar Donetsk.

Swansea nwere olile anya ịzụta Andre Ayew site na West Ham.

Otu Crystal Palace na North End ekwekọrịtala n'isi Preston n'ọnụ ego dị £8m.

Ndị Chelsea ekwela ịzụ ọgba bọọlụ ndị Roma bụ Emerson Palmieri n'ịkwụ ọnụ egọ dị £17.5m.

Leeds United erutala nso ịmabuta onye na-echere ndị Arsenal goolu bụ Emiliano Martinez.

Ndị otu Motherwell ajụla ọnụ ego dị £200,000 ndị Celtic kwere n'isi onyeoche bọọlụ ha bụ Trevor Carson.

Isiokwu Ndị Emetụtara