Leicester City erela Ahmed Musa na mbinye

Onye kpọbatara Ah0med Musa na Leicester bụ onyeisi Claudio Ranieri Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye kpọbatara Ahmed Musa na Leicester bụ onyeisi Claudio Ranieri

Onye na-agbara Leicester City bọọlụ bụ Ahmed Musa agafela otu CSKA Moscow na mbinye rue mgbe afọ egwuregwu ga-agwụ

Nwafọ Naịjirịa dị afọ iri abụọ na ise bụ onye ndị leicester zụrụ n'ọnwa Julaị n'afọ 2016 n'ọnụ ego dị £16m.

Ọgbalịrị ike ya ịpụta ihe na Leicester City ebe onyere nanị ọkpụ goolu ise n'asọmpi iri atọ na isii.

Ndị CSKA Moscow kwuru na Musa ga-eso ha gba asọmpi ọdịnala ha n'akwa nke Europa.