Onye nche osote onyeisiala Somalia gbagala ọsọndụ na Belgiụm

Hassan Ali Kheyre Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Hassan Ali Kheyre bụbụ onye ọrụ na ụlọ ọrụ mmanu agbịdị tụpụ e me ya osote onyeisiala na Somalia

Onyeisi nchekwa nke osote onyeisiala Somalia bụ Hassan Ali Kheyre gbapụrụ ọsọndụ na Belgiụm.

Ayub Ali so onyeisiala Somalia je Davos na mba Swizaland ebe ndị ochichi si mba ụwa di icheiche zukọrọ maka okwu akụnụba ụwa a na-akpọ "World Economic Forum" na asụsụ Bekee.

Ndị mara maka okwu a na akọwa onye a zoro onwe ya na ụlọ mposhi na ulọ ndị ọbia onyeisiala Somalia na ndị ụrụ ya nọ.

Kita, a na-akọwa na o jeziri Belgium ije rịọ ka anabata ya ka onye na agba ọsọndụ.

Anakọwa na agbanyeghị na ihe a na kwụ Mazi Ali kwa-onwa bụ $1,000 (ebe N364,000), Mazi Ayub Ali were na ọ ka ya mma ịgba ọsọndụ maka ike ndị otu egwu al-Shabab na akpa na obodo ha.

Onyeisiala Somalia mabụrụ na Ayub Ali na akwado igba ọsọ.

A na ele anya na ọ ga etinye onye ọzọ ga anochị anya ya na ọrụ.

A na akọwakwa na ọ ima mmadụ bu ihe eji agafe ụzọ na Somalia, ya mere ejighị atabi anya na onyeisiala mba ahu mara maka ihe a onye nchekwa ya mere, agbanyeghị na o si na ya na ebuso mpụ agha.

Isiokwu Ndị Emetụtara