CHAN 2018: Ọzụzụ na oririe ndị egwuregwu nwereike gbochie Morocco

Ashraf Bencharki Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ashraf Bencharki nyere Wydad Casablanca aka ị nweta iko "African Champions League" nke 2017.

Ndị a na-agba asọmpị bọọlụ nke ndị egwuregwu bọọlụ na agba na mba Afrịka di icheiche a na-akpọ CHAN na nkenke na be ha bu Morocco, nwere ike nwete ngbochi na atụmatụ ha nwere maka ibute iko.

Ihe kpatara ihe a bụ ozi na apụta na mmadụ abụọ bụ ndị so na ndị kachasị agba bọọlụ na otu egwuregwu bọọlụ nwere ike ije igba bọọlụ na mba ofesị.

Ndị a bụ Achraf Bencharki na Jawad El Yamiq. Ha na akadọ ịrapụ otu egwuregwu ha na agbara bọọlụ na Morroco na Wenesde gawa otu egwuregwu bọọlụ Al Hilal Riyadh nke Saudi Arabia na El Yamiq nke Italy.

Bencharki, bụ onye na agba na etiti, ga arapụ Wydad Casablanca ndị bu iko nke Afrịka, ka onyenchekwa bọọlụ El Yamiq ga arapụ Raja, nke dịkwa na Casablanca

Ha abụọ nwere ike esoghị sompị ha na Libya ga agba na Wenesde ma ya bụrụ na e goro ha tupu a kwusị ire na igo echi.

Ha kwesiri i nwe asambodo a na-akpọ International Transfer Certificate (ITC) ma denyekwe ya na aka ndị na ahu maka egwuregwu bọọlụ bụ Fifa tupu chi ejie echi.

Ihe kpatara ha agaghịzị eso gba bọọlụ bụ maka otu na ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Afrịka bụ Caf si na o sọ ndị na agba bọọlụ na be ha nwere iuke soro na CHAN.

Morocco me ka ha chere ka ha gbacha bọọlụ ha na Wenesde, ohere ama dichazị iji hazie akụkwọ ndị a.

Na mbido CHAN 2018, Guinea nyere nsogbu maka Elsmani Elsawi Saadeldin nke Sudan ha si na agbaara Al Ittihad Tripoli nke Libya, mana Caf si na ha enweghị okwu maka nchopụtaha gosiri na o na agba bọọlụ na be ha mgbe ahụ.

Stephen Eze nke Naijirịa ka ga na agba na CHAN maka ọ mgbe agbachara ka o ga aga Lokomotiv Plovdiv nke Bulgaria maka ndị mba ahu kana oge ma na ere.

Isiokwu Ndị Emetụtara