Usain Bolt na-akuziri ndị otu Mamelodi Sundowns ka esi agbasi ọsọ ike

Usain Bolt Image copyright @Masandawana
Nkenke aha onyonyo Ndị Mamelodi Sundowns nabatara Usain Bolt ọfụma

Onye ọgbaọsọ ama ama akpọrọ Usain bolt azụọla otu dị na Saut Afirịka akpọrọ Mamelodi Sundowns.

Ọ kuziri ha ka esi agbasị ọsọ ike. Bolt na ndị otu Sunsdown na ekekọrita otu ngalaba nkwado akpọrọ Puma.

Ha abụọ bụcha ndị nmeri.

Bolt si na ihe nkuzi ọsọ a ya na ndị Mamelodi Sunsdown gosiri na ahụ esichaghị ya ike.

O kwukwara na oruo Jamaica, na ọ ga-gba mbọ gbatia ahụ ya ka ọ gbasie ike.