Patience Jonathan adapụtala n'ikpe ya na EFCC

Patience Jonathan soro di ya me emume mgbere ntụliaka n'afọ 2015 Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Patience Jonathan soro di ya me emume mgbere ntụliaka n'afọ 2015

Ụlọ ọka ikpe ukwu nke gọọmentị etiti di na Abuja,ekwetala ijụ ikwusi ulọ ọrụ n'ahụ maka inyocha mpu ego na nrụrụaka n'inyocha nwunye onye bu bụrụ onye isii ala Naijirịa, Patience Jonathan.

Onye ọkaikpe ukwu akpọrọ Justice John Tsoho wepuru ya bụ ikpe Patience kpọro 'mwakpo mgbe ọbụla'.

Patience Jonathan mara ndị EFCC iwu ijeri naira abuọ(N2Billion Naira) na n'ọnwa June afọ 2017 maka imebi ikike diri ya.

EFCC gbakwara akwukwọ nke ha iji me ka kachie ya bụ ikpe maka na ọ lara niyi usọrọ ikpe.

EFCC gwara ulo ikpe na ha machiri akautu Patience maka nchọpụta zuruoke gosiri ego na-ezighi ezi nabata na Akautu ya.

Justice Tsoho kwesiri ike na onweghị ihe aka ebe gbara ọkpụrụ kpụ gosiri na EFCC wakporo Patience Jonathan.

Isiokwu Ndị Emetụtara