George Weah: A ga ma-ewepu ikpa oke agburu n'Liberia

George Weah Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo George Weah bụ onye egwuregwu AC Milan na Chelsea mgbe ọ na-agba bọọlụ

Onye isi ala ọhụrụ nke mba Liberia bụ George Weah ekwuola na gọọmentị ala Liberia kwesịrị ịkabị iwu na-enye sọọsọ ndị ojii akwụkwọ obibi n'ihi nọọbụ ikpooke agbụrụ.

Weah kwuru nke a n'okwu nke mbu ya dịka onye isi ala ọhụrụ.

O kwukwara na ya ga-kabii iwu na-gbochi ụmụ ndị ala ọzọ ị nwe ala nke ha na Liberia.

Ọ bụ ndị ohu mụtara Liberia na afọ 1847, dịka ebe ndị ohu nwere onweha ga-ebi.

Nkenke aha onyonyo Ọria ebola gburu ọtụtụ mmadụ na Liberia na afo 2014 na 2015

Iwu ala Liberia kwụsịrị ndị obodo ọzọ dịka ndi lebanese ruru puku anọ ị nweta ala nke ha.

Na akụkọ yiri ibe ya, George Weah kwere nkwa na ya ga-ekewa ụgwọ ọnwa nke ya n'ụzọ anọ makana Liberia enweghi ego.

Weah kwuru na "gọọmentị anyi enweghi ego, akwụkwọ ego Liberia na-ada n'ala, umu anyi enweghi ọrụ"

Ọtụtụ mmadụ na-ekele Weah maka ihe a okwuru.

George Weah merịrị Joseph Boakai na ntụlị aka nke Liberia mere na afọ nke garaaga.