Ndị ome ihe nkiri 'Black Panther' gosiri Afrịka n'emume mbido ha

Ndị so mee ihe nkiri "Black Panther" goziri omenala Afrịka mgbe ha gara mmeme mbido ya bụ ihe nkiri nke ụlọọrụ Marvel mepụtara.

Ha niile kere ekike mba Afrịka di icheiche maka na ha kwuru sị na ọ dị mkpa igosi Afrịka nke ọma.

Chadwick Boseman bụ onye jere ozi dịka T'Challa, Eze mba Wakanda, bụ onye e ji maka ya mee ihe nkiri "Black Panther", duuru ndị ọzọ nọ n'ihe nkiri a gaa ebe emere mmeme a na Los Angeles.

Ndị dịka Lupita Nyong'o, David Oyelowo, Daniel Kaluuya, Michael B Jordan, Danai Gurira na Angela Bassett kere ekike ndị Afrịka.

N'akwụkwọ eji gwa ndị mmadụ maka mmeme a, e dere sị ha jikere ka "ndị eze Afrịka".

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo David Oyelowo bụ nwa afọ Naịjirịa na Nwunye bụ Jessica so bịa emume a
Image copyright Jesse Grant
Nkenke aha onyonyo Janeshia Adams-Ginyard nọchitere anya Danai Gurari dịka Okoye Dora Milaje na ihe nkiri a
Image copyright Jesse Grant
Nkenke aha onyonyo Lupita Nyong'o bụ onye Kenya nweterela ihe nrite ndị na-eme ihe nkiri a na-akpọ Oscar
Image copyright Jesse Grant
Nkenke aha onyonyo Chadwick Boseman bụ onye mere ka T'Challa n'ihe nkiri a
Image copyright Neilson Barnard
Nkenke aha onyonyo Danai Gurira bụ nwa afọ Zimbabwe mere ka Okoye Dora Milaje n'ime ihe nkiri a

Ọ ga-adị mma ka ndị ome ihe nkiri ndị ọzọ na Hollywood bido ije omume ha a?

Isiokwu Ndị Emetụtara