Gịnị mere ndị ụlọakụ ji amịpụ ego ndị mmadụ n'ụzọ na-ezighi ezi?

Ndị sineti

Ebe foto si, @nigerian_senate

Nkọwa foto,

Etu ndị ụlọ sineti ga-esi mezie ego ndị ụlọakụ na-ewepụ

Ọtutụ ụmụ Naịjirịa ajụọla ajụjụ a dịka ha na-ekwuputa mwute ha gbasara ego ndị ụlọakụ ha na-ewepu n'ego ha n'ụzọ na-ezighi ezi.

N'ọnwa Jenụwarị 2018, ndị ụlọomeiwu sineti kpọrọ onyeisi ụlọakụ ukwu (CBN) bụ Godwin Emefiele, ka ọ bịa zara ọnụ ya ma kọwaara ụmụ Naịjirịa ihe kpatara o ji dị ka ego ha enweghizị ezigbo nchekwa n'ụlọakụ ebe ha debere ya.

Nke a bụ maka na ọbụrụ na ndị ụlọakụ anaghị ewepu ego maka ozi ha zitere gi, ha na-ewepu ego maka kaadị eji ewere ego.

Ndị a abụghị nsogbu mana ihe na-agbagwoju ndị mmadụ anya bụ ugboro ole a na-ewepụ ego ndị a n'ime otu ọnwa.

Nke a bụ maka na otu onye ihe a metụtara gwara BBC Igbo na oteela ihe a na-eme, wee zitekwara anyị foto ụfọdụ gbasara mwepụ e mere n'ego ya.

Ego ewepụrụ
Nkọwa foto,

Ewepụrụ ego maka otu ihe ugboro atọ n'ọnwa

Foto a na-egosi ego ndị ụlọakụ a wepụrụ n'ego mmadụ maka otu ihe n'ime naanị ọnwa Jenuwarị. Ha wepụrụ naịra iri ise n'ego onye ahụ ugboro atọ maka otu ihe n'ọnwa Jenụwarị.

Ọbụghị naanị ihe a ka ndị mmadụ na-ekwu maka ya, a na-ekwukwa na ebuturu ego ole a na-ewerezi n'igwe eji ewere ego bụ ATM n'aha ịchafụ.

Tupu ugbua, ATM na-enye ihe ruru puku naịra iri abụọ otu oge nke bụ ị dọrọ ego rue ugboro atọ n'ụlọakụ na-abụghị ụlọakụ gị, ewepụ ego maka ya.

Mana ugbua, ọtụtụ ụlọakụ na-enye naanị puku naịra ise nke pụtara na tupu ị were puku iri abụọ ahụ i nwere ike iwere na mgbe mbụ, ị ga-ewere ego ihe ruru ugboro anọ, ị chọzịa iwere ihe ruru puku otu narị naịra, a ga-ewere ego gị karịa.

ATM

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Ndị na-eweta ego ruru puku otu narị naịra nwere ike ịkwụ ụgwọ karịa ugboro iri

Gịnị kpatara ihe dị otu a ji eme ebe ndị ụlọakụ nwere ndị ntuziaka bụ ụlọakụ ukwu CBN?

Ọpụtara na CBN anaghị etinye uchu n'ihe ndị ụlọakụ a na-eme? BBC Igbo gbalịrị inweta ndị ụlọọrụ CBN mana ha azaghị oku.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ