Akwamozu Ekwueme: Ndị isi ala ochie na gọvanọ di iche iche agbakọla

Ebe ile anya ikpeazụ.
Nkenke aha onyonyo Ekwueme so na ndị mere ka ọchichi onye kwuo uche ya laghachite n'ala Naijiria

Ndị mmadụ karịrị puku ise gbakọtara n'Ọkpara square dị n'Enugwu taa ịsị Alex ekwueme laa mmụọ ya n'udo.

Mmemme ahụ jiri Ika ụka wee bido. Onye isi nchụ aja na ya bụ ụka ọnwụ bụ nnukwu ukọchukwu ndi Anglican bu bishop Emmanuel chukwuma gwara ndị gbakọrọ n'emume a ka ha ṅyomie ezigbo ndụ

Ekwueme biri mgbe ọ nọ ndụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBishop Chukwuma na dụ ndị biara emume a ọdụ

Ekwueme nwụrụ n'ụlọọgwụ dị na London na Dicemba 2017.

Ndi gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ jikọrọ ọnụ biakwa na ya bu okpara square kwanyere Alex Ekwueme ugwu.

Ndi biara bu gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugu, Dave umahi, Ebonyi, okezie ikpeazu Abia, ebe osote gọvanọ Imo bu eze Mmadụmere nọchitere anya gọvanọ Rochas Okorocha.

Ozokwa osote gọvanọ Anambra bụ Nkem Okeke nọchitere anya Willie Obianọ.

Nkenke aha onyonyo Ndị ọbịa biara emụme a kwuru ọtụtụ okwuọma gbasara Ekwueme.

\

Nkenke aha onyonyo Osote govanọ ndị Imo steetị Eze Mmadụmere

Nwanne ya bụ Laz ekwueme bụ onye ọkanmụta duru ndị ukwe buọ ukwe Halleluia nke oji si nwanne ya jee n'udo.

Ụfọdụ ihe dimkpa ikwesiri ima maka Alex Ekweme?

  • Alex bụ Dókinta ji asambodo di iche iche tupu ọnwuọ
  • Ọ bụ osote onye isi ala Naijiria eji mbinye aka n'akwukwọ họputa
  • O so na ndị mere ka ọchichi onye kwuo uche ya laghachite n'ala Naijiria
  • O keputara mpaghara ọchịchị isii na Naijiria akpọrọ Geo-political zones
  • Ọ bụ ya chọputara parti anakpọ PDP na Naijịrịa.