A malitela otu njikọ nke Obasanjo dere maka ya

Olusegun Obasanjo
Nkenke aha onyonyo Obasanjo degaara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi toro ogologo iji sị ya azọla ọchịchị ọzọ n'afọ 2019

Amalitela otu njikọ Coalition For Nigeria nke Olusegun Obasanjo tụrụ aro ya n'akwụkwọ ozi odegaara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'ụbọchị iri na abụọ na atọ nke Jenụwarị, taa.

Obasanjo tụrụ aro a abịaghị mmemme a emere na Yar'Adua Centre dị n'Abuja, Olagunsoye Oyinlola na Donald Duke nọ na otu PDP oge ha bụ gọvanọ, so na ndị bịara.

N'ime akwụkwọ ozi ahụ Obasanjo chịbụrụ Naịjirịa degaara Buhari, o kwuru sị na ndị otu APC na PDP enweghi ikike iji edozi Naịjirịa n'ọnọdụ ọ kwesịrị ịnọ, maka na ndị mmadụ enwezighi ntụkwasị obi n'ebe ha nọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Cheta na n'ime akwụkwọ ozi ahụ Obasanjo dere, ọ gwara Buhari na ya chefuo maka ịzọ ọkwa ọchịchị ọzọ ma oge ya gwụ na 2019.