Na Borno, a gbara ndị enweghị ebe obibi ogbunigwe

Ndị mmadụ nọ n'ebe obibi ndị gbara ọsọ ndụ dị na Borno Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadụ agbala ọsọ ndụ n'ihi nsogbụ mkpamkpa Boko Haram na- akpa na mpaghara n'ugwu Naijiria

Otu onye ojiogbunigweagbagbuonwe egbuola mmadụ anọ n'ebe obibi ndị gbara ọsọ ndụ dị na Dalori nke Steeti Borno.

Dịka Garba idris bụ onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe mberede bụ NEMA siri kwuo, onye gburu ndị ahụ si n'agbata dị n'azụ ebe obibi ahụ bata ma topee ogbunigwe a n'etiti ndị mmadụ

Garba kwuru,"Ọ gbagburu onwe ya n'etiti ụlọakwa ndị a ma merụọ mmadụ iri anọ na anọ ahụ."

O kwuru na enwebeghi ndị kwuru na ọ bụ ha mere nke a, mana a na-eche na ọ bụ otu Boko Haram kpara mkpamkpa ahụ.

Ka otu nkeji nke mbụ gbachara, onye ọzọ gbagbukwara onwe ya n'ebe ọzọ dị nso mana onweghị onye ometụtara.

Otu nwa nwaanyị bịatara n'etiti ndị mmadụ, ebe ndị a bidoro nyochawa ya n'ụjọ ma gbaa ọsọ tupu ọgba ogbunigwe ahụ.

Mwakpo a bịara dịka ndị agha Naịjirịa na-ebu agha iji chụpụ ndị Boko Haram n'oke ọhịa Sambisa ebe ha zoro.

Cheta n'abalị iri na asaa nke ọnwa Jenụwarị, ndị Boko Haram gbagburu ndị mmadụ iri, merụọ mmadụ ruru iri ise ahụ site na ogbunigwe ha gbara ugboro abụọ n'ebe ize ndụ dị na Muna.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Maiduguri dị na Naịjirịa bụ ebe agha a kacha ada ụda