West Ham akwụsịla onye na-ahụ maka ọzụzụ ndị egwuregwu ọrụ n'ike

Njirimara West Ham Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo West Ham nọ na ogogo iri na abụọ na tebulu Premier League

West Ham akwụsịla onye na-ahụ maka iwe ndị na-agba bọọlụ bụ Tony Henry ọrụ n'ike maka ebubo eboro ya sị na-okwuru na agaghị azụtazị ndị mba Afrịka na-agba bọọlụ ọzọ.

West Ham mere nyocha a maka ebubo eboro ha n'iwu ha mechiri ịzụ onye ọbụla na-agba bọọlụ si mpaghara Afrịka.

Akụkọ si n'aka Daily Mail kwuru na ndị West Ham kwụsịrị ịzụ ndị ọgba bọọlụ si mpaghara Afịrịka maka "mgbe ha esoghị n'otu egwuregwu ha na-ebute ọgbaghara".

Okwu ndị otu egwuregwu a wepụtara kwuru si: "Anyị na-akpọ ebubo ọbụla metụtara ịkpaoke dịka oke ihe"

"Anyị na-eme nyocha tara ọchịchị gbasara ebubo a."

"Otu egwuregwu a kwuru na ha na-eme nkwado ha niile dịka otu ndị n'enweghi ịkpa oke ọ bụla" na "otu a bụ nke na-akwanyere egwuregwu bọọlụ ugwu."

West Ham nwere ụmụ afọ Afrịka na-agbara ha bọọlụ n'ogogo dị elu gunyere Cheikhou Kayoute, Pedro Obiang, Joao Mario, Arthur Masuaku na Edimilson Fernandes.

Ebe nwafọ Senegal bụ Sakho hapụrụ otu ahụ n'ọnwa Jenụwarị a gawa otu Rennes dị na mba France.

West Ham nọ na ogogo iri na abụọ na tebulu Premier League.

Isiokwu Ndị Emetụtara