Samuel Eto'o abanyela otu egwu bọọlụ, Konyaspor

Samuel Eto'o Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Samuel Eto'o ga-aga n'ihu na ọrụ agbam bọọlụ na mba Turkey

Samuel Eto'o banyere okaibe otu Konyaspor ebe ọ ga- anọ afọ abụọ na ọkara.

Nwa amadi a nke gbara afọ iri atọ na ise na ọtu egwu bọọlụAntalyaspor nwere nkwekọrịta tupu ya pụọ na club ahụ.

Eto'o nọrọ afọ abụọ na ọkara na mba mmiri Mediterranean ka ọ pụtachara na Sampdoria na ọnwa July, afọ 2015.

Eto'o onye nwetarala nzere dịka 'African footballer of the year winner' enyela ọkpụ iri anọ na anọ na ọgbụgba bọọlụ iri asaa na asaa ọ gbara ndị Antalyaspor, ebe o nwere onwa ise tupu oge akwụkwọ n ngo orụ ya si kwue.

Akwụkwọ ozi otu egwu Antalyaspor dere kwuru si: "Anyị na kaptin anyi kwekọrịtara tupu anyị agbasa. Otu egwu bọọlụ anyị na-ekele ya maka nkwado onyere ma na-asi ka ọ gazierea ya, The club thank him for his contribution and wish him success for the future."

Anya ndị otu egwu bọọlụ mba Spain bụ Celta Vigo dịbu na Eto'o tupu obodo Konya.