Ụlọikpe Kenya akwụsịla mmechi ụlọ ngosi TV

Onye na-agụ akụkọ na KTN TV Image copyright KTN
Nkenke aha onyonyo Achụpụrụ ndị ntaakụkọ nọ n'ikuku mana ha ji igwe mgbasa ozi youtube na-agbasa ozi iyi ọrụ ahụ

Mmechi a bụ maka na ha kwadoro igosi onyeisi pati na-anọghị n'ọchịchị ebe ọ na-edu onwe ya iyi ọrụ.

Gọọmenti etiti mechiburu ụlọọrụ ngosi ndị ahụ maka na ha gbasara ozi gosịrị Raila Odinga ebe ọ na-edu onwe ya iyi ọrụ ma kpọkwa onwe ya onyeisiala mba Kenya.

Odinga emerighị na ntuliaka emere n'afọ 2017, ebe a na-ahụta iyi ọrụ ahụ o duru onwe ya dịka ihe "agwụ".

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara oke na ugwu ruru mmadụ bụ Okiya Omtata kpụpụrụ gọọmenti Kenya ụlọikpe ka ha kwụọ ndị ụlọọrụ ngosi ahụ e mechiri ụgwọ maka mmechi ahụ.

Ego ndị ụlọọrụ ngosi TV furu ruru nde dola

Okiya gwara ụlọikpe ahụ ka ha kpebie na mmechi ahụ emechiri ụlọọrụ NTV, KTN na Citizen TV megidere iwu.

Onye ọrụ BBC nọ na Kenya bụ Ferdinand Omondi kwuru na ndị Kenya nọ na mwute maka ya bụ mmechi maka na ha anaghị enweta ihe ngosi masịrị ha.

Ndị ulọọrụ ihe a metụtara kwuru na ego ha ruru nde dollar efuola maka na ha ereghi ahịa mgbasa ozi.

Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 mana e megharịrị ntuliaka ahụ n'ihi na ndị ụlọikpe kagburu nke mbụ.

Raila Odinga bụ onye ndu pati na-anọghị n'ọchịchị esonyeghị na ntuliaka mmegharị ahụ e mere n'ọnwa Ogostu afọ 2017.

Isiokwu Ndị Emetụtara