Legọs steeti emepeela ulọikpe ọhụrụ maka ndị awakporo

Nwaanyi na-azọ onwe ya ka aghara itigbu ya Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mpụ nwakpo na-eweta nnukwu mwute na Naijiria

Titilola Vivour-Adeniyi bụ onyeisi na-ahụ maka ndị awakporo na ndị a na-emesiike (Domestic and Sexual Violence Response Team, DSVRT) na Legọs steeti, gwara BBC na ọ bụ eziokwu na-ekewapụtala ụlọikpe ga na-elekọta ndị nwere udịrị mmetụta a.

Onyeisi ọkaikpe ndị Legọs steeti bụ Opeyemi Oke mepere ụlọikpe abụọ ndị a n'Ikeja, taa bụ ụbọchị nke mbụ Febụwarị.

Emepekwara ụlọikpe ndị ọzọ ga-ahụ maka mpụ ndị ọzọ a na-eme na Legọs.

Onyeisi ọkaikpe bụ Zainab Bulkachukwa, Justice MI Garba, nwunye gọvanọ Legọs bụ Dolapo Ambode, osote gọvanọ Legọs bụ Idiat Adebule, na nwunye osote onyeisiala Naịjirịa bụ Dolapo Osinbajo, so na ndị ukwu bịara mmepe ụlọikpe a.

Kedụ ndị ihe a metụtara?

Vivour-Adeniyi kwuru sị na onye ọbụla na-awakpo mmadụ na onye ọbụla na-emesi onye ya na ya bi ike (domestic violence) na-achọ gọọmentị okwu.

Nke a kpatara na anwụchie gị ka ịkpara ọdịrị agwa a, gọọmentị ga-eji aka ha ekpe gị ikpe.

Isiokwu Ndị Emetụtara