Ụlọikpe akwadola ndị sineti na ọjụjụ Magu

Magu Image copyright EFCC FACEBOOK PAGE
Nkenke aha onyonyo Buhari họpụtara Magu ugboro abuọ ka ndị sineti were ya dịka onye isi EFCC

Ulọikpe ukwuu dị na Abuja ekwetala na ndị sinetị Naijiria mere ọfụma ijụ Ibrahim Magu dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka agha a kpọrọ EFCC.

Onyeisi ala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari họpụtara Magu ịbụ onyeisi EFCC ugboro abụọ mana ndị sineti jụrụ ya ugboro abụọ.

Dịka nkachi a si ga, ọkaikpe ukwu a kpọrọ John Tsoho kachiri na EFCC echeghị ọfụma mgbe ha na-eche na ndi sineti ga nabatarịrị nanị onye ndị isi ọchịchị họpụtara.

Tsoho kwuru na sineti nwere ikike i mgba mbọ hụ na sọsọ ndị tozuru etozu ka a ga họpụta maka ọrụ onyeisi ngalaba n'ahụ maka ibuso mpụ na nrụrụaka na Naijirịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara