Nwụchị ndị Kameruun: UN akatọọla mba Naịjirịa

Foto Sisiku Ayuk Tabe Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ayuk Tabe bị na mba Naịjirịa ụfọdụ oge tupu anwụchịe ya

Mpaghara otu United Nations na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ akatọọla mba Naịjirịa maka ịchabị iwu jịkọtara mba ụwa niile mgbe ha kwere ka Gọomenti mba Kameruun bịa nwụchie onye ndu ndị mpaghara Kameruun na-asụ bekee na ndị otu ya.

Ndị otu a bụ UNHCR n'olu bekee, kwuru, "Ọ bụ ihe nwute n'ihe gbasara Sisiku Ayuk [Tabe] na mmadụ iri anọ na ise ndị achụgha chịrị na mba Kameruun n'izuka."

Anwụchiri ndị a n'Abuja n'abalị ise nke ọnwa Jenụwarị.

Kameruun kpọrọ ndị a "ndị na-eyị ndụ egwu" ma kwuo na ha "ga-azara ọnụ n'ime mpụ ha mere" dịka enwere oke ụjọ na mpaghara Kameruun ndị na-asụ bekee.

Ndị a emela mkpesa gbasara mmegbu ha na-ahụ n'okwu akụ na ụba na mba Kameruun.

Ayuk Tabe chọrọ ka ha kwapụ site na mba Kameruun mgbe ndị otu ahụ kwuputara nwere onwe ha n'ọnwa nke afọ gara-aga.

Ndị UNHCR kwuru na mmadụ iri anọ na asaa ndị a degara mba Naịjirịa akwụkwọ maka ihe izendụ.

Ha chetara mba Naịjirịa iwu mba ụwa niile megidere ịchụpụ n'ike ndị bịara izendụ ma gwa ha ka kwụsị agwa ahụ.

Ndị otu a chọrọ nwereonwe kwuru na-aha chọrọ ka Gọọmenti Kameruun kwuo ihe mere onye ndụ ha bụ Ayuk Tabe kamgbe anwụchiri ya na ndị ọzọ n'ọnwa jenụwarị.

"Anyị chọrọ ihe ga egosi na onye ndu anyị ka-adị ndụ." dịka onye ode akwụkwọ mpaghara ndịda Kameruun bụ Chris Anu kwara BBC.

Onyeisi ala mba Kameruun bụ Paul Biya na-ebu agha megide ndị chọrọ nkewapụ, ebe ojirila ndị agha wakpo ha ọtụtụ oge, tinye ọchịchị ọdịrịụkọ, ma machie ha ime njem.

Ihe ndị ịkwesịrị ịma gbasara Paul Biya

Image copyright AFP
  • Paul Biya bụ onyeisi kacha anọte anya n'oche ọchịchị n'ụwa niile
  • Amụrụ Paul Biya n'afọ 1933, ọgụrụ akwụkwọ na mba Cameroon na France bụ ebe ọmụrụ maka ikpeikpe na Sorbonne.
  • Ndị ome iwu mba Kameruun mere iwu n'ọnwa April afọ 2008 nke mere onyeisiala Paul Biya ịzọ ọkwa ọchịchị nke ugboro atọ n'afọ 2011
  • Ọkwesiri bụrụ ị bụ onyeisi ụlọụka
  • Nwunye mbụ ya na-batara nwanwoke nwanyị ọzọ mụrụ ya
  • Ihe a na-akpọ Chantel bụ Ezenwanyị obịoma
  • Biya bụ onye kachasị enwe ego na mba Kameruun niile.

Naịjirịa na Kameruun nwere esemokwu gbasara oke ala Bakassi Peninsula.

Ugbua ị dị na nma ha malitere kamgbe ha bidoro buwa agha megide ndị otu na-eyị ndụ egwu bụ Boko Haram n'agbata mba abụọ ahụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ọ bụ nke a mere ndị orụ nchekwa Naịjirịa jiri nwụchịe Ayuk Tabe ma were ya nye mba Kameruun.

Isiokwu Ndị Emetụtara