Ọrịa Kansa akpamamịrị egbuola karịa kansa ara

Onye na-arịa kansa Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo kansa akpamamịr na-aka egosi oge ụmụnwọke ruru afọ iri anọ

Ọnụọgụgụ ụmụnwoke na-anwụ site n'ọrịa kansa akpamamịrị akarịala ọnụogụgụ ụmụnwaanyị na-anwụ site n'ọrịa kansa ara dịka nchọpụta siri kwuo na mba UK.

Ụmụnwoke na-aka nka pụtakwara na ọtụtụ ka na-enweta mana anwụ site n'ọrịa ahụ.

Ndị nyocha gbasara ọrịa kansa nọ na mba UK kwuru na nchọpụta na ọgwugwọ a na-eme maka kansa ara na-amịta mkpụrụ ebe itinye ego gbasara kansa akpamamịrị umụnwoke ga-enyekwa aka.

Nchọpụta ọnụọgụgụ pụtara site n'afọ 2015 gosiri na mmadụ 11,819 nwụrụ site na ọrịa kansa akpamamịrị ebe mmadụ 11,442 nwụrụ site na ọrịa kansa ara.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kansa akpamamịrị kachasị n'ụmụnwoke nọ na UK

Ndị ọrụahụike ekwuola na nchọpụta n'oge kachasị mkpa iji gwọ akpụ kansa.

BBC Igbo gbara Dọkịnta akpọrọ Remi Ajekigbe ajụjụ ọnụ,o kwuru na ọrịa kansa ara ka egbu karịa ọrịa kansa akapamamịrị na Naijirịa.

O kwukwara na ebe nsogbu na dịkari bụ na ụmụnwoke anaghị bia nyocha ahụ n'oge.Ha na bia mgbe ihe ọ ka njọ.

"A na-agagharị na-akuziri ndị mmadụ n'ulọ akwukwọ,chọọchị,ulọakụ na ebe ndị ọzọ maka ọria Kansa nakwa ka esi egbochi ya".

Emume ndị a ka a ga-eji nabata ụbọchị nrụbama ibuso agha ọrịa kansa bụ Februwarị anọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara