Ndị mbịa mbịa: Ọtụtụ emiela mmiri na Libya

Mmiri Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ isi Liya gafe mpaghara Europe mana ọnụọgụgụ ha adaala.

Ihe ruru mmadụ iri itoolu bụ ndị mbịa mbịa emiela mmiri ka otu ụgbọ mmirikpuru na mmiri dị na Libya dịka UN siri kwuo.

Mmadụ atọ ndị agbapụtara kwuru na ndị nwụrụ hinne bụ ndị mba Pakistan.

Libya abụrụla ụzọ ndị mbịmbịa na-esi agba mbọ iji rue mpaghara Yurope site na mmiri.

Mana n'afọ gara aga, otu EU kwekọrịtara na ha ga-enyere ndị nche na mmiri Libya aka ịkwụsị ụgbọ ndị bụ ndị mbịambịa nakwa ndị na-agbaga mba Italy.

Ndị na-enye aka nakwa otu UN ebola ndị gọọmenti EU na ha anaghị eme nkeọma.

"Ozu mmadụ iri ka mmiri buputara n'akụkụ mmiri" dịka otu na-ahụ maka ndị mbịambịa bụ International Organisation for Migration (IOM)

Ọtu onye ọnụ na-erụ n'okwu kwuru na ndị mba Pakistan na-agbalịsiike ime njem ahụ.

Ụfọdụ akụkọ gbasara njem na-ekwesighi ekwesi a na-eme na mba Libya pụtara n'afọ 2017 nke butere mba ụwa jiri tinye ọnụ na ya bụ okwu.

Akpọghachitala ọtụtụ ndị njem ahụ bụ ndị Naịjirịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara