Arsene Wenger: Ahụ esichaghị Aubameyang ike

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Okwu n'ekwu na Aubameyang adịghị ike ipụta gba asọmpị nke mbụ ya n'Arsenal.

Onye nchịkọta ndị otu bọọlụ Arsenal bụ Arsene Wenger ekwuola na ahụ ike adịghị onye egwuregwu bọọlụ ha gotere bụ Aubameyang.

N;ihi nke a ọ gaghị adị ike ipụta na asọmpị nke mbụ ya na premier league otu Arsenal na Everton ga-agba echi.

Aubemayang denyere aka n'akwụkwọ na mbido izuuka a were si n'otu Germany bụ Borrussia Dortmund gafere na Arsenal.

Wenger kwuru na "anyi ga enyochaya ahụ were mata etu ahụ dị ya. Ahụ ọkụ n'ere ya, nke a mere ọjịghị nwe ike kwado maka eguwregwu a. Mụ na ndị na-ahụ maka arụ isi ike ga enwe nkwekọrịta maka ike ya"

Nke a bụ nke Wenger kwuru mgbe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ, Ọ gwakwara ha ịhe oji gote Aubameyang.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAubameyang kọwara ihe mere o jiri hụ Arsenal n’anya