Tinubu:Edemede Obasanjo bụ egwuregwu ndọrọndọrọ

Tinubu ebe ọ nọ na ọgbakọ ndị otu ya bụ APC na ntuliaka nke afọ 2015 Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo 'Edemede ahụ bụ nke aghụghọ'

Onyeisi otu nọ n'ọkwa ọchịchị nke a na-akpọ, 'APC' bụ Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala okwu maka ihe edemede Obasanjo degara Buhari.

Ọ sị na Obasanjo na-egwu 'egwuregwu ndọrọndọrọ' n'edemede ahụ.

Ọ sị na ebe ha abụọ bụ ndịchịrị n'okpuru ndị agha, Obasanjo kwesiri ịkpọ ya n'azụ dọọ ya aka na ntị kama ị gwa ya n'ihu ọha.

O ruola izuụka abụọ Obasanjo degara Buhari edemede ahụ na-asị ya ritue n'ọkwa,ghara ịzọ ọchịchị na afọ 2019.

Ọ sị na ọbụrụ n'obi dị Obsanjọ ocha, o kwesiri ịkpọ onyeisiala Buhari n'akụkụ gbaa ya izu.

O kwuru nke a ebe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na Owere (Owerri) ka ọ na-akwado ịga mmemme nkwanye ugwu Alex Ekwụeme.