Nwoke anwụọla izuụka atọ o si ogbenye feere ogaranya

Nkwu mnwereonwe dị na Nu Yọk a na-akpọ 'statue of liberty' na bekee Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Savastano bụ onye obodo Nu Yọk. Ya na ikom nwanyi ya bụ Julie Wheeler bi ebe ahụ

Donald Savastano bụ nwoke akụkọ ndụ na-ebute anya mmiri ebe ọbụla akọrọ ya.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Daily news' sịrị kwuo, Savastano rụrụ ọrụ osisi ndụ ya niile mana o nweghị ego zuru oke iji ga ụlọọgwụ leta onwe ya.

Mana ndụ ya gbanwere mgbe ọ gbara egwuregwu lọtịrị nke 'merry millions' ma nweta otu nde dọla.

Savastano gwara ndị ụlọọrụ lọtịrị mgbe ọ gara i were ego mweta ahụ sị: " Ị gwa gị eziokwu, ihe ga-agbanwe ndụ anyị. Aga m azụ ngwongworo ọhụrụ. Enwere m ike gakwa ezumike.

"Enweghị atụmatụ ezumike nka, n'ihi ya, ego a ga-enyere m aka inwe ya."

Ihe mbụ oji ego ahụ mee bụ iga ụlọọgwụ ebe a chọpụtara na o nwere ọriaakpụ nke pụrụ igbu ya n'oge adịghị anya.

Savastano nwụrụ ọnwụ ka izuụka atọ gachara o jiri nweta ego lọtịrị n'ihi ọrịa akpụ nke ndị dibia bekee chọpụtara n'ahụ ya.

Ndị mmadụ na-enwe olileanya na ego ahụ ga-azọ ndụ ya mana nke ahụ emeghị.

Donald Savastano bụ onye obodo Nu Yọk nke dị na mba Amerịka gbara afọ iri ise na otu mgbe ọ nwụrụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara