Ebe ndị Naịjirịa gara n'ahịa orire na ọzụzụ

Ahmed Musa na Brown Ideye Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ahmed Musa na Brown Ideye so n'otu Naịjirịa buliri iko mba Afrịka na 2013

Emechiela ahịa orire na ọzụzụ nke egwuregwu bọọlụ, mana ebee ka ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa na-agbazị ugbua?

Ahịa orire na ọzụzụ nke ndị egwuregwu bọọlụ mechiri n'ụbọchị ikpeazụ nke Jenụwarị, ka ọtụtụ ndị egwuregwu si n'otu ebe ha nọ gafee n'otu ndị ọzọ.

Ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa so na ndị si n'otu klọb gafere ọzọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Elderson Echiejile so n'otu Naịjirịa buliri iko mba Afrịka na 2013

Ebe ha si na ebe ha gara

  • Ahmed Musa si Leicester City gaa mbinye na CSKA Moscow
  • Isaac Success si Watford gaa mbinye na Malaga
  • Chidiebere Nwakali si Manchester City gaa Aberdeen na mbinye
  • Emmanuel Emenike si Olympiakos gaa Las Palmas na mbinye
  • Oghenekaro Etebo si Feirense gaa Las Palmas na mbinye
  • Ideye Brown si Tianjin TEDA gaa mbinye na Malaga
  • Elderson Echiejile si AS Monaco gaa mbinye na Cercle Brugge
  • Shehu Abdullahi si Anorthosis Famagusta gaa mbinye na Bursaspor
  • Nosa Igiebor si Vancouver Whitecaps gaa mbinye na Anorthosis Famagusta
  • Fred Friday si AZ Alkmaar gaa mbinye na Sparta Rotterdam