Ụka Anglịkan: Kwụsị njem ahụike

Primate Nicholas Oko
Nkenke aha onyonyo Primate Nicholas Okoh kwuru na ndị Naijiria na elufu nde kwuru nde na njem ọgwụgwọ ọrịa

Primate Nicholas Okoh akatola agwa ndị gọọmenti nakwa ndị nkịtị ji agbaga obodo oyibo iga nara ọgwụgwọ n' ụlọ ọgwụ ha.

Ọ gwara ndị ọchịchị gọọmenti na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gbakọrọ ụka olili ozu onye jibụ ọkwa osote onyeisi ala n'oge gara aga bụ Alex Ekwueme.

Ọ tụrụ arịrị na ụlọọgwụ dị na Naijiria erijughị afọ, ebe obodo dịka India na Dubai na-ekpokọ nde kwuru nde naira n' aka ndị ala anyị were na- emepe obodo ha.

Pia aka ebe ha ị nụrụ ihe ọkwuru na uju:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPrimate Nicholas Oko akatọọla ụlọ ọgwụ Naijiria

N'otu olu ahụ, Achịbishọp ụka Anglịkan nke Enugwu Eklesiastịkal Prọvinsị bụ Emmanuel Chukwuma katọrọ obubu gọọmenti buru Alex Ekwueme gaba obodo oyibo maka nleta tupu ọ nwụọ.

Chukwuma onye kwuru okwu chukwu n' Okpara Square dị n'Enugwu gwara gọọmenti ka ha kwụsị iga ala bekee maka ọgwụgwọ ọrịa onwe ha ebe ndị mmadụ na-atakuta ihe aja na Naijiria.