West Ham achụọla Tony Henry

West Ham Image copyright Getty Images

West Ham achụọla Tony Henry bụ onye na-ahu maka ịhọpụta ndị ọhụrụ na-agbara otu egwuregwu ahụ bọọlụ n'ihi na o kwuru na ya ga-akwụsị ị nabata ndị egwuregwu bọọlụ si mpaghara mba Afrịka.

West Ham kwuru na ha nyochara ya bụ okwu tupu ha chụọ Tony Henry.

N' akwụkwọ ozi ha, West Ham kwuru na ha ekwetaghị n'ikpaoke agbụrụ.

Mana onye nkuzi ha bụ David Moyes kwuru na tupu a chụọ Henry, ọ họpụtara ndị egwuregwu bọọlụ abụọ sị na mpaghara Afrịka.

West Ham kwuru na ugbua ha chọrọ ị zụ Islam Slimani bụ onye ala Algeria ya na Ibrahim Amadou, onye ala Kamerun.

Otu ndị na-agba bọọlụ akpọrọ 'The Professional Footballers Association' na olu bekee kwuru na okwu ọnụ Tony Henry jụrụ ha n'anya.

West Ham nwere mmadụ isii ndị Afrika ndị na-agbara ha bọọlụ.

Ha bụ; Cheikhou Kouyate, Pedro Obiang, Joao Mario, Angelo Ogbonna, Arthur Masuaku na Edimilson Fernandes.