EFCC: Danladi Umar sịrị mmadu nye ya puku dola ole na ole

Bukola Saraki Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo EFCC bụ ndị kpe onyeisi omeiwu bụ Bukola Saraki ga ụlọikpe

A kpụrụla onye isi ụlọikpe na-ahụ maka nyocha mmerụaka bụ Danladi Umar ga ụlọikpe.

Ụlọọrụ na-enyocha mmeruụaka na Naijiria bụ EFCC bụ ndị kpe ya na-ulọikpe.

Ha na-ebo Umar ebubo na ọ nara otu onye nwere ikpe mmerụaka ego ruru puku dollas ole na ole.

Nke a abụghị nke mbụ a na-ekpe Umar n' ụlọikpe maka mmerụaka.

Onwebeghị ihe Umar kwuru gbasara ebubo nke a.

Onyeisi ala Naijiria bụ Mohammadu Buhari ekwuola na ya ga kwụsị mmerụaka na Naijiria.

Na akwụkwọ e ji bo Umar, EFCC kwuru na Umar chọrọ ego ruru nde naira ịrị na aka otu nwoke akpọrọ na Rasheed Owolabi Taiwo.