Nwoke egbụọla ịbe ya abụọ na Saut Afịrịka

Okwa onye bụ bụ onyeisiala na Saut Afịrịka bụ Nelson Mandela Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Johannesbourg ebe ihe a mere bụ isi obodo Saut Afịrịka

Otu na enekọrịta ndị mba Naịjirịa bi na Saut Afịrịka ekwuola na akụkọ a mere eme n'ezie

Ha kwuru na onye Naịjirịa ibe ha egbuola ndị otu ha abụọ siite n'iji mma sugbu ha n'ụzụ ụtụtụ taa.

Onye odeakwụkwọ otu ahụ bụ Emeka Ezinteje gwara ndị ntaakụkọ na ihe butere onwu ndị a bụ esemokwu ego.

Ọ sị kwa na ndị uwe ojii ebidola nyochapụta ihe mere eme na ka-osi mee.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị uwe ojii Saut Afịrịka eburu la ozu ha gaba ụlọọgwụ

Enyere aha ndị a nwụrụ anwụ bụ Maazi Ekwegharịrị Chịdị onye Ehime n'Imo steeti na Maazị Nzechukwu Alabuche onye Azia n'Anambara steeti.

Onye gburu ha ka-akpọrọ Sunday onye Awgbụ n'Anambara steeti kwa.

Akụkọ n'apụta kwuru na Sunday agbapụla ọsọ banye na nzizo mana ndị uwe oji n'achọ ya.

Asị na ebe nke a mere bụ na obodo Rossetinville na mpaghara ndida Johannesbọgụ bụ isi obodo Saut Afịrịka

Isiokwu Ndị Emetụtara