Udọ jikọrọ Cape Town city na Victor Obinna adọbiela

Victor Obinna onye ọgbaa bọọlụ Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Victor Obinna bụ onye nwetara ọkwa ọla ọcha n'egwuregwu Olympics n'afọ 2008.

Obinna banyere n'otu egwuregwu a bụ Cape Town City onye nkuzi ha bụ Benni McCarthy n'ọnwa Sepụtemba afọ gara aga

Otu bọọlụ ahụ na-enwe olileanya na Obinna ga-enyereha aka bunyite ọkwa ha siite n'inye gọọlụ na asọmpị ndị ha ga-enwe.

Mana Obinna nyere sọsọ otu gọọlụ n'ime ugboro iri n'anọ ọ pụtara ịgbara otu City ahụ bọọlụ n'asọmpị.

N'ihi nke a, Obinna na ndị otu City ahụ enwela nkwekọrịta na ọ ga-ahapụ ha.

Isiokwu Ndị Emetụtara