Anwuchiela ihe ruru mmadụ 200 si Mexico aga Amerịka

Ndị si Mexico eji Amerịka Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyi na ụmụaka so na ndị a hụrụ na ime gwongworo ahụ

Ihe ruru mmadụ nari abụọ (200) si ndida Amerịka aga mba Amerịka ka a hụrụ na ime gwongworo eji ebu ibu.

Ụmụ aka, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyi nọ na okpuru gwongworo a enweghị mmiri mọ bụ nri mgbe a chopụtara ha na Tamaulipas Steetị di na ugwu Mexico.

Ndị a si Guatemala, Honduras na El Salvador na eje Amerịka.

Ndị na ahu maka mpụ gbasara ire mmadụ na Mexico na akọwa na ha nwụchikorọ mmadụ atọ aka ha nọ na okwu a.

Uweojii na Mexico si na ha kwusiri gwongworo a na ebe ha na eme nyocha na okporo ụzụ were chọpụta na ọ mmadu ka ezoro na ime ya.

Ndị goomenti Mexico na-akọwa na ụmụ aka nne mo bụ nna esoghị nọ na ime gwongworo a.

Na onwa gara aga, ihe kariri mmadụ otu nari na iri asaa ejighị akwụkwọ ha ji aga Amerịka ka ejidere na steetị Coahuilia ba Tamaulipas di na Mexico.

Ndị si Guatemala, Honduras na El Salvador kachasi na ndị ejighị akwụkwọ a na nwauchiko ka ha na eji Amerịka.

Onyeisiala mba Amerịka bu Donald Trump ekwuola na ya ga eji aka ike so ndị na abata Amerịka na ụzọ akwụghi ọtọ, ma na ekwusikwa ike na ya ga arụ mgbidi na ụsọ Amerịka na Mexico.

Isiokwu Ndị Emetụtara