Otu goolu Aubameyang nyeala Aresenal aka imeri Everton

Pierre-Emerick Aubameyang Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Pierre-Emerick Aubameyang bụbụ onye kachasi nye goolu na Bundesliga. Onyere goolu iri ato na otu (31)

Onye ego eji go ya kachasi na Arsenal bụ Pierre-Emerick Aubameyang zikọrọ ihe eji were nde pound iri ise na atọ zụta ya na aka Borrussia Dortmund na sọmpị ha na Everton pịara ụnyahu.

Egwuregwu a bụ nke mbụ Aubameyang na gbara ndị Arsenal. Arsenal meriri 5-1. Aubameyang nyere otu goolu na sompị a bu nke izizi o na agbara ndị Arsenal.

Na okara nke mbụ na sọmpị a, Arsenal zikọrọ Everton ihe ihere ka ha nyere ha ọkpọ goolu anọ ha azataghi.

Na okara nke abuọ, nyere otu goolu site na aka Dominic Calvert-Lewin, mana egwu nọzị na ngwucha mgbe ahụ.

Aaron Ramsey kpiakara onụ gooolu ndi Everton ugbolo atọ. Nke bu mbụ o na enye udiri goolu a.

Theo Walcott gbakwara bọọlụ a unyahụ na nnaghachite ya na Arsenal, ma ọ Laurent Koscielny bu onye ọzọ gbakara net ndị Everton.

Isiokwu Ndị Emetụtara