Ndị asọmpị Naịjirịa atọ Morocco nwere ike ịrọ anya taa

Ezenwa Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ezenwa nwere ike iga Russia ma agbacha CHAN 2018.

Anthony Naịjirịa na Morocco ga sọmpị taa na Marrakech na ngwucha CHAN 2018. Any na gosi mmadụ atọ bụ ndị asọmpị Naịjirịa ekwesiri ịrọ́ anya.

1:Ikechukwu Ezenwa

Ezenwa bu onye ndụ ndị otu asọmpị Naịjirịa na CHAN 2018. Ọ gosiri onwe ya na CHAN 2018 ọfụma, ma tụrụkwa ugo ka onye kachasị gba bọọlụ na sọmpị Naịjirịa na Angola sọọrọ.

Ezenwa na echere ndị Enyimba goolu.

2: Anthony Okpotu

Okputu bụ onye nyekarị goolu na asọmpị nke a na-akpọ Nigeria Professional Football League na asụsụ bekee n'afọ gara aga. Ọ zikọro onwe ya na CHAN, ma nyekwa goolu ... Ọ na agba n'ịrụ.

3: Gabriel Ikechukwu

Ikwchukwu bidoro na Warri Wolves, banye Kano Pillars tupu ọ je Bayelsa United ọ nọ ugbua. Ọ na-agba n'ịrụ.

4:Rabiu Ali

Ali tọchara ndị niile na-agbara Naịjirịa bọọlụ na CHAN. Ọ di afọ iri atọ na asaa. Ọ bụ aka ochie ama-ama, ma bụkwara onye Kano Pillar ji ama atụ. Ọ na agba na etiti.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa meriri sọmpị niile ha gbara na CHAN 18.

Naijirịa na Morocco ga agba bọọlụ taa iji ma onye ga ebụrụ iko CHAN. Na asọmpị nke agbara ụnyahụ Sudan jiri penaliti merie Libya ji bụrụ ndi nke atọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara