Babangida na-akpọ ndị Naịjirịa ha chụtuo Buhari n'ọkwa ọchịchị

Babangida chịrị Naịjirịa n'ọkwa ndị agha siite n'afọ 1985 we rue 1993 Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Babangida chịrị Naịjirịa n'ọkwa ndị agha siite n'afọ 1985 we rue 1993

O malitere ị gwa ndị Naịjirịa ha kwere ka mmekọ dị n'etiti ha na onyeisiala mana ha gba mbọ hụ n'ọlaghachi hi n'afọ 2019.

Okwuru nke a na edemede okwu ọ wepụtara taa bụ orịe, ụbọchị anọ n'ọnwa Ferbụrụwarị. Ọ sị na ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na mpaghara ala Naịjirịa akariala onwe ya

Ọ sị na ntuliaka nke na-abịa ga enye ndị mmadụ ohere iji gbanwe ihe n'eme n'obodo were malite i gwọ obi mgbawa dị ebe niile ma bụtekwa udo n'ala Naịjirịa.

N'ihiokwu a, O sonye la na ndị na-asị Buhari ya azọna okwa ọchịchị nke oge abụọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Babangida azọla ọchịchị n'oge gaara aga

Ọ sị na ihe n'ewute ya bụ onwụ ndị mmadụ na-anwụ, ọ kpọrọ Naịjirịa ala 'ebe obara n'ekwo ma anya mmiri juru anya niile'.

"Anam enye ndụmọdụ nke a ka onye chịburu Naịjirịa burukwa oganiru ya n'obi m". Ọ sịkwa na na agha ana ebuso ndị Boko Haram, na ndị agha Naịjirịa kwesiri ị ba n'ikpa Sambisa ga chụọ ndị n'eyi ndụ egwu karịa iche ka ha mepụta emume tupu achụba ha.