Deportivo La Corun̄a achụọla Cristobal Parralo

Cristobal Parralo Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Deportivo nwetere nanị pọintị abụọ n'ime asọmpi asaa ikpeazụ ha gbara ka Cristobal Parralo nọ n'ọkwa

Ndị otu Deportivo La Coruna ebidola ịchọ onye ga-anọchi anya onye nkuzi ha, Cristobal Parralo, ka ha chụchara ya n'ọrụ taa.

Onye nkuzi nke ga-abịa ugbua ga-abụ onye nke anọ ga-anọ n'ọkwa ahụ n'ime otu afọ a.

Parralo nọchiri anya Pepe Mel bụ onye na-akuziburu West Brom, n'ọnwa Oktoba gara aga, oge Deportivo ka nọ n'ọkwa iri na isii na La Liga.

Mana tupu achụọ ya, Deportivo si n'ọkwa iri na isii daruo ọkwa iri na asatọ na tebulu, nke kpatara na ọ bụrụ na-amaghị nke emere, ha nwere ike isi ebe ahụ gafee na Segunda División.

N'ihe ndepụta ndị otu Deportivo dere, ha kwuru sị "Deportivo chọrọ ikele Cristobal maka mbọ niile ọgbara, etu o si ranye onwe ya na ọrụ ọrụrụ n'oge ọ bụ onye nkuzi nke otu nke mbụ".

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Nwaafọ Naịjirịa bụ Francis Uzoho bidoro ichere ndị Depọrtivo goolu n'ọnwa Oktoba 2017

Tupu Parralo dị afọ iri ise ebido ikuziri ndị otu Deportivo nke mbụ, ọ bụ bụ onye nkuzi nke ndị otu nke abụọ (team B).

Ọchụchụ achụrụ ya emeela ka ọ bụrụ onye nkuzi nke isii, onyeisi otu Deportivo bụ Tino Fernandez na-achụ n'ọrụ kemgbe oji banye n'ọkwa n'afọ 2014.