Morocco emeriela Supa guls na CHAN 2018

Naịjirịa na Morocco Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa ji mmadụ iri gbaso mmadụ iri na otu Morocco na sọmpị a.

Mba Morocco nọ na Cassablanca ụbọchị ụka wụọ ndị otu egwu bọọlụ Supa Iguls n'ala dịka ha gbara ha ọkpụ anọ asataghị otu we buru iko CHAN nke afọ 2018.

Ọkpụ goolu abụọ sitere n'aka Hadraf ebe El Karti na Ayoub El Kaabi nye otu otu golu.

Ọkpụ goolu ndị ahụ nyere mba Morocco, bụ ndị emere asọmpi ahụ na be ha, okpu mmeri nke mbụ maka asọmpi ahụ gbasara ndị nọ n'ụlọ agba bọọlu.

Ndị Supa Iguls ji naanị mmadụ iri mechie asọmpi ahụ dịka a chụpụrụ Moses Eneji na nkeji iri anọ na asatọ maka mmejọ o mere. Asọmpi ahụ bụ nke mbụ Eneje na-agba na ya bụ asọmpi CHAN afọ a.

Mana ndị Atlas Lions Morocco nọ na-achị na ya bụ asọmpi site na nkeji nke mbụ ebe ha na-enye ndị Iguls ọsọ dị egwu ma chọọ inye ha golu ọtụtụ oge.

Ohere mbụ ndị Atlas Lions nwere bụ iji nye golu bụ na nkeji nke anọ oge El Kaabi gbapụrụ bọọlụ nke mbụ. El Kaabi si n'akụkụ gbakanye ya bụ bọọlụ mana onye nchịkwa gbuchiri ya bụ bọọlụ.

El kaabi biakwara ọzọ na nkeji iri na ise dịka o si n'akụkụ ya bịa mana Hadraf bụzi onye nyere golu nke mbụ na nkeji iri anọ na anọ oge El Haddad kpara Osas Okoro gafee Dele Ajiboye.

Oge agba nke abụọ, obi lọrọ ndị Supa Igul mmiri dịka a chụpụsịrị Eneji maka mmejọ o mere nke ugbo abụọ. Morocco jidesiri onwe ha ike na nkeji iri isii na otu oge El Karti jiri isi tinye bọọlụ ka Ajiboye jisiri aka kụpụ ya.

Ndị Iguls bụ ndị gbara ndị nke atọ na asọmpii CHAN nke afọ 2014 na Sout Afịrịka enwetaghi ike ọbụla ebe ndị Morocco nọ dịka ndị Morocco nwetara ọkụ golu nke atọ na nkeji abụọ na-eso oge Hadraf gbakanyere golu ọzọ ebe onweghi onye na-elebanyere ya anya. El kaabi mechiziri ọkpụ ahụ na nkeji iri asaa na atọ oge ndị nchekwa Supa Iguls mere njehie.

Ndị Supa Iguls Naịjirịa gbara ndị nke abụọ we buru iko sịlịva ebe mba Sudan ụbọchị Satodee meriri ndị na-echekwa iko ahụ bụ mba Libya ọkpụ anọ asatara abụọ site na penariti iji bụrụ iko buronzu.

Isiokwu Ndị Emetụtara