Jacob Zuma ekweghị ịrịtu n'ọkwa

Jacob Zuma Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Zuma gbadoro ukwu na ala si na ya ama rịtu n'ọkwa.

Ozi si Saut Afrịka apụta na akọwa na onyeisiala ha bụ Jacob Zuma ekweghị ịrịtu n'ọkwa dịka otu ndi otu ya bu ANC siri cho.

Zuma na mmadu isi bu ndị kachasị nwe ọkwa na ANC nwere nzụkọ ụnyahụ na beya na Pretoria. Nzụkọ bu ka ha were kwuo maka otu Zuma ga esi were rapụ ọkwa n'udo.

Mazi Zuma di afọ iri asaa na ise, ma bụrụ onye a na ebo ebubo maka mpụ na awụwọ.

Onye na ahazi ka o nochịe anya Zuma bu Cyril Ramaphosa, bu onye ndị ANC họpụtara ka onye isi na afọ gara aga. Ramaphosa bụ osote onyeisiala Saut Afrịka ụgbụa.

Ndị na ahazi ihe na ANC a na-akpọ National Working Committe ga eme nzụkọ pụrụ iche iji kwu maka Zuma taa.

Ana atu anya na ha ga elebanye anya ụzọ aga esi wopu Zuma, nke nwerike imetụta aka na isi ndi ome iwu tinye ọnụ na okwu a.