A ga-egbochili ọgụ ndị ọrụ ụgbọ na ndị Fulanị na-achị ehi

Fulani herdsman watering his cattle Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo A na-ebo ndị Fulani na-achị ehi ebubo na ha egbuola ihe karịrị mmadụ otu nari n'izu atọ gara aga

Kọmishona na-ahu maka mgbasa ozi nke Kano steeti bụ Mahd Garba arachala Gọvanọ ya bụ Abdullahi Ganduje ọnụ n'oku ahụ ọ kpọro ndị Fulani na-achị ehi ha lọtawa na steeti ha.

Kọmishọna a kwuru nke a mgbe ya na onye ntaakụkọ BBC kparitọtara ụka taa bụ afọ mgbụrụ mbọchị ise nke ọnwa Febuwarị.

Gọvanọ Ganduje sịrị na ha nwere ala ga abata nde mmadụ bụ ndị na-achị ehi, ọkachasị ndị sị Taraba nakwa Benue steeti bụ tigbuo zọgbuo ka njọ.

Ganduje bụ onye Fulani gwara ụmụnne ya ha lọtawa kama ha na ndị ọrụ ụgbọ ga na-egburikọta onye ha na steeti dị iche iche.

Dịka BBC pidgin siri dee, o siri na Gọvanọ ahụ sịrị n'ala karịrị na "Rogo, Gaya, Kura, Tudun Wada, Ungogo n'ebe ndị ọzọ gọọmentị hapụrụ ala maka nchekwa ụmụanụ na akụkụ".

Gọvanọ ahụ sịrị na ha nwere ihe niile ga-enyere ndị na-achị ehi aka ime ka ahụ sie ehi ha ike.

Ọ sịkwa n'ala ya wapụtara ha ga-abata ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ahịa, ebe egwuruegwu n'ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ị kpata ego ma nyere ndụ aka.

Ọ bụ tigbuo-zọgbuo dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị Fulani na-achị ihe karịrị afọ atọ bụtere oku a Gọvanọ a kpọrọ.