A nwụchiela ndị egwu bọọlụ ise n'Bangladesh

Ịga Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Aka akpara ndị egwuregwu bọọlụ eboro ebubo mpụ

Ndị uwe ọjii na mba Bangladesh kwuru na ha nwụchiri mmadụ asaa gụnyere ndị egwuregwu bọọlụ Naijiria na Dhata bụ isi obodo ya maka mpụ.

Dịka ụlọ ntaakụkọ obodo ahụ bụ Daily Star siri kwuọ, ndị Naịjirịa sonyere na ndị a eji bụ; Ogokhoya Onochi, 32, Maurice 34, Obinna, 35, Henry 24, Anthony Kozito na Arrengi, 26.

Ndị ọzọ so na ndị uweojii jidere ụbọchịụka bụ ndị amala Bangladesh aha ha bụ MdKausar Ahmed and Raisul Islam Asad.

Daily Star kwuru na onyeisi nyocha mpụ na mba ahụ bụ Mollah Nazrul Islam kwuru na ha nyochara na akwụkwọ ego iri na itoolu ma chọpụta na-e nwere ihe nrụrụaka.

Ka BBC Igbo jụrụ onye mgbasa ozi NFF bu Demola Ojajire maka ihe mere, o kwuru si "enweghị m ike ikwu ihe ọbụla banyere ya. Anyi enụbegh ihe ọbula maka ihe a."

Anyị ga ewetara gị akụkọ n'uju.

Isiokwu Ndị Emetụtara