E meela ngagharịiwe megide mmechi ụlọọrụ ngosi TV na Kenya

Ndị ngagharịiwe na mba Kenya Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ngagharịiwe chọrọ ka emepe ụlọọrụ ngosi TV gọọmentị mechiri

Gọọmenti emeghị ihe ụlọikpe kwuru si ka emepe ụlọọru atọ ndị ngọsi TV ahụ.

Dịka Mercy Juma, onye ntaakụkọ BBC nọ na Nairobi siri kwuo, ike karịrị mmadụ narị abụọ bu akwụkwọ ozi ma na-agụ egwu na-ekwu ka gọọmenti kwanyere iwu ala ahu ugwu site na i gbape ụlọọrụ atọ ndị ahụ.

Ndị otu abụghị gọọmentị ahụ na-eme ngagharị iwe rịọrọ onyeisiala Uhuru Kenyatta ka o tinye ọnụ n'okwu ahụ ma mee ka ụlọọrụ KTN, NTV and Citizen TV lọghachị n'ikuku.

Otu onye na ndị haziri ngagharịiwe ahụ bụ Tom Oketch kwuru sị: "Gọọmentị na-eme ihe ọjọọ megide ndị Kenya. Ha na-enupu isi n' ihe iwu kwuru oge ọbụla."

Mana ebumnobi ndị ahụ na-eme ngagharịiweiwega akwụkwọ ozi ha ụlọ omeiwu bịara na njedebe mgbe ndị uweojii jiri ikuku anwuru ose gbasa ha.

Cheta na gọọmenti mechiri ụlọọrụ ngosi TV atọ izuụka gara aga maka na ha gosiri Raila Odinga,onye ndu otu na-agba gọọmenti ukwu n'iyi ọrụ o duru onwe ya.

A kakpọchiri ụlọọorụ ndị na-agbanyeghị na-ụlọikpe nyere iwu ka gọọmentị mepe ha.

Nke yiri ya bụ na gọọmentị nwuchiri ma kpụpụ ndị ọchịchị atọ maka isonye n'iyiọrụ nke Odinga duru onwe ya.

Mba Britain, US na otu UN,African Union kọtọrọ Odinga maka iyiọrụ o duru onwe ya, ma kwugidekwa mmechi emechiri ụlọọrụ ntaakụkọ.