Ihụtụla nwaanyị gbara ajị ka nwoke?

Harnaam Kaur na Queen Okafor Image copyright Queen Okafor's Facebook
Nkenke aha onyonyo Harnaam Kaur banyere n'akwụkwọ ndị Guinness World Records ka nwaanyị kacha gbaa afọọnụ n'ụwa, ebe Queen Okafor nwere ike ịbụ nwaanyị kacha gbaa-ajị na Naịjirịa

Lee ụmụnwaanyị gbara-ajị ka nwoke ihere anaghị eme.

Ọ bụ eziokwu na nwoke gbaa oke ajị anaghị ele ya anya ugboro abụọ ka ọ bụ ihe ọhụrụ, mana nwaanyị gbaa-ajị ka nwoke, ọ bụrụ okwu akpụ n'ọnụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ nwere ike ikwu na afọọnụ maọbụ ajịobi na-aka mma n'ahụ nwoke, mana ụmụnwaanyị a gbara yabụ ajị achọghị ịma.

Ụfọdụ ndị na-ahụ nwaanyị gbara ajị ka ọ bụ ihe ọjọọ, nke kpatara ụfọdụ na-eji akwa ha emu maka etu chineke sị kee ha.

Ụmụ nwaanyị abụọ ihe a metụtara bụ nwaafọ Naịjirịa bụ Queen Nonyerem Okafor na Harnaam Kaur bụ onye Britain.

Mmadụ abụọ a ekweghi ka etu ha dị mee ha ihere, nke kpatara na Kaur dị afọ iri abụọ na asaa bụzị nwaanyị mbụ n'ụwa banyere n'akwụkwọ ndị Guinness n'afọ 2016 maka ihe gbasara ịgba afọọnụ.

Okafor n'onwe ya dị afọ iri atọ, na-agụ akwụkwọ na National Open University nke Nigeria, bụrụkwa onye ama ama na mpaghara Naịjirịa maka ajị ọgbara n'ahụ ya niile.

Image copyright Queen's Facebook
Nkenke aha onyonyo Queen Nonyerem Okafor na-agụ Politikal Sayensị na mahadum

Mana onwere ihe o mere ma nwaanyị gbaa ajị ka nwoke?

Ọtụtụ oge, ọ na-abụ maka etu ahụ nwaanyị si mmepụta mmiriọgwụahụ bekee na-akpọ hormones, na-eme ka nwaanyị gbaa-ajị dịka nwoke.

Nke a pụtara na ahụ ha na-emepụta ihe sayensị na-akpọ testosterone nke ukwuu n'ahụ ha kama ịmepụta ọtụtụ progesterone na oestrogen.

Sayensị emeela ka mmadụ mara na onwegi ihe ọjọọ ọbụla dị na nwaanyị ịgba-ajị ka nwoke.

Isiokwu Ndị Emetụtara