Ndị omekome agbahapụla ụgbọmmiri ha ji

ụgbọmmiri Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo ụdịrị ụgbọmmiri a awakporo

Ndị omokome ji ụgbommiri eji ebu mmanụ agbidi ahapụla ya.

Ụlọ ọrụ Anglo-Eastern nke mba Hong Kong, bụ ndị nwe ugbọmmiri a, na-ekwu na mmadụ iri abụọ nọ na ime ugbọmmiri a mgbe ejidere ya di ndụ.

"Ahụ zuuru ndị na akpọ ụgbọ a oke. Mmanụ ha bu ka nọkwa ebe ọ na dị."

Ebidoro chọwa ụgbọmmiri na ebe a na-akpọ Gulf of Guinea ka ndị na ege nti anutaghị mkpatụ ya na mba Benin.

Ndị omekome na emezi oke mwakpọ na etiti oshimiri ahu a na-akpọ Gulf of Guinea na asụsụ Bekee.

Ha na edo ndị ha ga atọrọ wey anata ego, agbanyeghị na ụdiri mwakpo ahụ na ebelata na mpaghara uwa ndị ọzọ.

Ụlọ ọrụ na ahu maka ihe banyere oshimiri a na-akpọ International Maritime Bureau (IMB) na bekee wepụtere akwụkwọ gosiri na ebe a bụ ebe ekwesiri etinye anya maka ike a ndị omekome na-akpa.

Isiokwu Ndị Emetụtara