Watford anyụọla Chelsea ịkpakwụ

Olivier Giroud Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Olivier Giroud dara ka a na-agba asọmpị a

Watford ji ọkpụ goolu atọ nye Javi Gracia mmeri nke mbụ na be ha na sọmpị ha si ga-aburụ ya "abalị a ma chefu echefụ".

Mmeri a nyekwara onye nkụzị ndị Chelsea bụ Antonio Conte nsogbụ maka a na sị bụ ya bụlịte ọkpa.

Chelsea ji mmadụ iri gba bọọlụ a ka a piarụ Tiemoue Bakayoko red card na ime nkeji iri atọ.

Babayoko sọọrọ sọmpị a ka onye ụkwụ jiri ma nyekwa Watford ohere enye goolu anọ n'ime ya.

Ndị Watford meriri sọ otu n'ime bọọlụ iri na abụọ ha gbabụrụ tupu ha na Chelsea kwakọ isi a.

Chelsea sara goolu mgbe Eden Hazard si ebe tere aka gbaka ọnụ goolu Watford.

Ka nkeji abụọ gara, Daryl Janmaat zara ọtụtụ ndi nche Chelsea tupu o ji ukwu ịcha ya nye goolu.

A gbachara 3:1, nke meziri Watford ji nọrọ okpa isi n'eru mpọda a na-kpọ relegation zone na asụsụ bekee.

Isiokwu Ndị Emetụtara