Ndị Uweojii si na ha na chọ Afegbua maka okwu IBB kwuru

Kassim Afegbua, onye n'ekwuchitere Babangida Image copyright Kassim Afegbua
Nkenke aha onyonyo Kassim si na ya anaghị agba ọzọ

Okwu ka na apụta maka ozi onye na chibụ Naịjirịa bụ Ibrahim Babangida zigara ndị nọ na ọchichị ugbua banyere etu ọchịchị ha si aga na etu Naịjirịa kwesiri ịdị gawa na iru na uche ya.

Nke na ewu kita bu okwu ndị uweoji Naịjirịa kwuru maka onye na ekwuchitere Babangida bu Kassim Afegbua bu onye ha si nwere aziza banyere etu o si zipu ozi a Babangida nyere ya.

Na ụtụtu taa, onye na ekwuchitere ndị uweojii Naịjirịa bụ Jimoh Moshood asafụghi ajụjụ ndị nta akụkọ ụlọ ọrụ Channels TV jurụ ya gbasara ihe Kassim mere eji achọ ya achọ.

Moshood si na ọ maka ozi ahụ Babangida dere, mana mgbe ajụrụ ya ma ọ bu Babangida sị ya kpọ Kassim, o taghariri ọnụ.

BBC kpọrọ onye ọkaiwu Kassim bụ Kayode Ajulo ọ si na ọ [Kassim] ga eje Abuja eche ga mara ihe eji akpọ ya, ma na ekwukwa na ha ga agba ndị uweojii na ndị nta ajkuko NTA akwụkwọ maka ihe ọ kpọrọ ebubo eboro Kassim.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo IBB ekwuala na ọ ya ziri Kassim ozi o jere

Na ọzọ, ụlọ ọrụ ọkaiwu Kayode Ajulo zịpụrụ ozi nye ndị nta akụkọ sị na okwu ndị uweojii kwuru wee kpọ Kassim onye a na-achọ achọ bu mmegịde banyere ya.

Ha kwuru na Kassim bụ onye nta akụkọ ama ama na gbụrụgbụrụ Naijirịa, bụkwa onye were ụlọ na Abuja na Benin, bụ isi obodo Edo steetị. Ha si na ha amaghị ihe mere uweojii ejighi je be ya ma ya bụrụ na ha chọrọ ịhụ ya.

H asikwa na ha enwetebeghi ọzị ndị uweojii.

Ha siri na o nwere etu esi etinye aha mmadụ ndị a na-achọ achọ ọchasị ya bụrụ onye ahu bu onye a na-elo na o mere ihe ojo ma ọbụ na o na agba ọsọ.

Anyi ga ewete ozi ọzọ maka ihe a n'iru.