Magụ: EFCC chọkọtara ego karịrị N500BN na 2017

Ibrahim Magu Image copyright Magu's facebook page
Nkenke aha onyonyo Magu kọwaputara ego ya ndị otu ya chọputara na arọ gara aga na Vienna.

Ibrahim Magụ kwuru na site na Jenụwarị ruo na Dịsemba n'afọ 2017, ndị ụlọ ọrụ ya chọpụtara ego karịrị ijeri narị anọ, iri asaa na atọ naira(N473 billion), nde dolla iri itoolu na asatọ ($98 million),

nde euro asaa (7million euro) na puku narị abụọ, iri itoolu na anọ pounds (294,000 pounds).

O kwuru nke a ebe ya na ndị otu ya gara nyocha na nkọwa bọgetị ụlọ ọrụ ya nye ndị ụlọ ome iwu n'ahụ maka nyocha mpu ego.

Magụ gwara ndị ome iwu na ụfọdụ ego ha chọputara na 2017 sonyere ijeri naira iri atọ na abụọ (32 billion naiira) nakwa ijeri ise dollars($5million) a hapụrụ government site n'aka Mịnịsta n'ahụbu maka mmanụ ụgbọala akpọrọ Dieziani Alison Madueke.

Ndị ọzọ ahapụrụ bụ nde narị anọ na iri anọ na itoolu naira(N449 million) achọputara na ụlọ ahia dị na Legọs, ijerị naira narị atọ, iri abụọ na itoolu si n'aka ndị na tụ mgbere mmanụ ụgbọala na kano,ụfọdụ si kwa na ntuisi ewekọtara n'ụlọ akụ di iche iche.

Magu si na owegarala ndị ụlọ ome iwu ya bụ nkọwaputa ego niile ya ndị otu ya chọputara.

Isiokwu Ndị Emetụtara