Saraki: Danladi Umar ahụla nsi n'aka ndị EFCC

Bukola Saraki Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ekpe Sarakị ikpe maka ekwuputachaghị ihe niile o nwere

Onye isi sineti akpọrọ Bukola Saraki ekwuputala obi ya n'igwe okwu twita gbasara onye n'ahụ maka ikpe maka aghụghọ sonyere ikpọ ihe o nyewere aha.

N'ọnụ ya,"ebere m na-emere onye n'ahụ maka ikpe m a akpọrọ Danladị Umar,onye ndị EFCC nọkatara kpụagharịwa ka ọ fọrọ abali anọ iji malite ikpem ọzọ."

"Lotanu na n'afọ 2016,mgbe ndị ome iwu gwara Umar ka o wepu onwe ya n'ikpe a maka nyocha mpu na nrụrụaka ana-eme gbasara ya na ndị EFCC si na aka ya dị ọcha.

O si na ọ na tọ ọchi ka EFCC si tugharịa kita si kwazia na Umar nwere mmetọ,"kedu ihe mebiri ka mgbe ọnwa Aprelu na arọ 2016"

Ọ bụ eziokwu na ndị Naijiria ka kwetere na ya bụ ikpe bụ maka aghụghọ gbasara ikọpụta ihe onye nwere mana aghụghọ sonye goro ya egosila na ya bu ikpe enweghị isi.

"A ka na-eche ma ndị hụrụ gọọmentị aghọtakwara otu agwa ndị EFCC Kpara si emebesi agha megidere mpụ na nrụruaka."

"Mana n'ime ihe niile a ka m nwere okwukwe na ndị omeiwu Naijirịa na ikike ha nwere iji kpezi ikpe ọbụla.