Zuma ekwuola ka-eyigharịa ụbọchị nkwuputa Saut Afrịka

Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Jacob Zuma Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo A na-atụ onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Jacob Zuma aka gbasara mpụ na nrụrụaka

Onyeisiala mba Saut Africa akpọrọ Jacob Zuma edegarala onye na-ekwuchitere ụlọomeiwu mba ha akpọrọ Baleka Mbete, akwukwọ gbasara nkwuputa ọkwesịrị ime.

N'ime akwụkwọ ahụ odegara ha, ọ na-ayọ ka-eyigharịa nkwuputa okwu gbasara ihe na-eme n'obodo nke akpọrọ (State of the Nation address) SONA n'olu bekee.

Eyinyeburu nzụkọ a n'ụbọchị Thọsde asatọ n'ọnwa Febrụwarị 2018.

Zuma rịorọ ka-eyinyegharịa ya bụ nkwụputa okwu maka ụfọdụ ihe mere na-enyechaghị ezigbo ohere iji wee zukọọ ma kwupute ya bụ okwu gbasara obodo.

Ndị ọrụ n'ahụ maka nzukọ a anabatala arịrịọ a.