Ọkụ agbagbuola mmadụ anọ n'okporouzọ Legos-Ibadan

Ọkụ ọgbụgba Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ tọrọ atọ na nkpọ (container) bu ha.

Ọkụ agabgbuola mmadụ anọ ebe ọtụtụ mmadụ ndị ọzọ tọrọ n'ime nkpọ n'agba ọkụ mgbe ya na ụgbọala bu mmanụ ụgbọala kụkọtara isi.

Ya bụ ihe mberede mere n'okporoụzọ Legọs-Ibadan taa.

Ndị ụlọ ọrụ mmenyụ ọkụ dị na Ogun steeti, ulọ ọrụ na-ahụ maka njem okporoụzọ na kwa ndị uweojii gbara mbọ ịzọputa ndị ọkụ a metụtara ma mee ka ụgbọala ndị ọzọ hụ ohere gafee n'udo ghara ịgbaba n'ọkụ ahụ.

Onye na-ekwuchitere ndị otu ụlọọrụ sonyere n'izọputa ndị ọku a gbara akpọrọ Traffic Compliance and Enforcement Agency (TRACE), Babatunde Akinbiyi, kwuru na ya bụ ugbọala bu mmanụ ụgbọala (tanker)

na-aga Ibadan ebe nkpọ (container) bu ndị mmadụ na-aga Iwọ dikwa na Ibadan tupu ihe mberede a emee.

O kwuru na ka ha abụọ kụkọchara isi, na mmanụ ụgbọala bidoro kwafuwe n'okporoụzọ nke butere ọkụ ọgbụgba a.

Isiokwu Ndị Emetụtara