Ụzọ asaa ị ga-esi echekwa onwe gị n'oge ọkọchị

Ndị ọkachamara NIMET ekwuola sị na ọkọchị nke afọ 2018 ga-aka njọ karịa afọ ndị ọzọ gara-aga.

Ndị otu Nigeria Meteorological Agency (NIMET) bụ ndị na-ahụ maka ihuigwe na ikuku na ihe ndị ọzọ gbasara ya, kwuru nke a iji gosi na ihe ndị bekee na-akpọ 'ozone layer' na-agbanwe karịa etu o si eme n'afọ ndị ọzọ garaaga.

Otu dọkịta a na-akpọ Ken gwara BBC ihe enwere ike ime iji kpuchie onwe gị niime ọkọchị, okwuru sị na nke a abụghị ọbere ihe maka na mmadụ niile na gburugburu ụwa kwesịrị ijikọ aka hụ na akwụsịrị ịmerụ ihuigwe ahụ.

Ọ sịkwa na iji kwụsị ịmerụ ihuigwe ahụ, na ndị mmadụ ga-akwụsị igbutu osisi nakwa ịgba ọhịa ọkụ.

Dọkịta Ken kwuru sị na ebe ịkwụsị nke a agaghị adị mfe, oke ọkọchị a bido, ndị mmadụ ga-achọ ụzọ ha ga-esi lekọta onwe ha ka ọ hapụ ịmerụ ha ahụ.

Lekwa ihe ndị ọzọ okwuru sị mee iji lekọta onwe ha:

  1. Ṅụọ mmiri

O kwuru sị na ọ ga-adị mma ịṅụ mmiri oge niile, ka ị nwee ike nwete nri ndị na-enye ihe n'ahụ pụrụ site n'ọsụsọ sụrụ gị na mamịrị ịnyụpụrụ anyụpụ.

2. Ṅụọ mmiri si na mkpụrụosisi

O kwuru sị na ịṅụ mmiri esi na mkpụrụosisi mepụta na-adị mma n'ahụ na-enyekwa ahụ gị ihe ndị ọchọrọ.

3. Mepee mpio gị

Image copyright Getty Images

O kwuru sị gbaa mbọ hụ na ị mepere mpio gị ma n'ụtụtụ ma n'abalị ka ikuku nwee ike ịbata ma n'ụlọ ma ebe ị na-arụ ọrụ.

4. Yiri uwe dị fịrịfịrị n'ahụ

Image copyright Getty Images

O kwuru sị na ọ na-aka mma iyi uwe dị mfe n'ahụ maka na iyi ihe dịka uweojii na-eme ka ọsụsọ dọrọ n'ahụ, nke ga-eme ka ahụ kpoo gị ọkụ.

5. Kpuru okpu sarambara

Image copyright Getty Images

O kwuru sị na ọ na-adị mma ikpu okpu sarambara nke nwere ike ikpuchi isi gị na ihu gị ka anwụ ghara ịtụ gị n'ahụ.

6. Tee ude na-egbochi anwụ (sunscreen)

Image copyright Getty Images

O kwuru sị na ọ na-adị mma ite ude a ka anwụ ghara ịgba gị ọkụ n'ahụ.

7. Saa ahụ

Image copyright Getty Images

O kwuru sị gbaa mbọ saa ahụ gị maọbụ hụ na ịwụsara mmiri n'ahụ gị oge ọbụla inwetara ohere.

Okwuru sị na imee ihe ndị a, inwere ike igbochi ihe ndapụta na-eso ọkọchị dịka: ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa, ịgbọ agbọọ, isi ofufe, oke ọsụsọ nakwa nke kacha njọ bụ kansa nke anụahụ.