Ramaphosa agwala ndị Saut Afịrịka n'ọga dị mma

Cyril Ramaphosa bụ osote onyeisiala Saut Afịrịka Jacob Zuma. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Cyril Ramaphosa bụ osote onyeisiala Saut Afịrịka Jacob Zuma.

Onye a na-eche na ọ ga anọchị anya onyeisiala mba Saut Afịrịka bụ Cyril Ramaphosa edepụtala akwụkwọ na gwa ndị Saut Afịrịka nwe ndịdị.

Ọ sị na ya na onyeisiala bụ Zuma na-enwe nzụkọ dị mkpa ka ha mara etu ha ga-ebute oganiru mba ha.

Ọ sị na ọrụ ọchịchị ga na-aga nke ọma, na nzụkọ ha agaghị egbochi ihe ọbụla.

"N'ime ihe nke a niile, ihembu n'obi bụ ọdịnma ndị Saut Afịrịka" ka o kwuru n'ime akwụkwọ a o depụtara.

Ihe na-eme na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mba Saut Afịrịka ụgbụa: akagbuola ọtụtụ nzụkọ na mmemme dịmkpa ka a na-eche ịhe ga abụ chi onyeisiala Saut Afịrịka bụ Jacob Zụma

Otu nọ n'ọkwa ọchịchị bu ANC ekwuola na ha na-aganiru ịnwe nzụkọ n'etiti Zuma n'onye echere ga-anọchị anya ya bụ Cyril Rmaphosa.

Ndị mmadụ echebela na ịhe ga-apụta ihe ndị a bụ na Zuma ga-ekwekọrịta ịrịtụ n'ọkwa ọchịchị.

Cheta nụ na ndị nnukwu mmadụ na Saut Afịrịka agwala Zuma ya ritue n'ọkwa ọchịchị maka ihe dị ịcheịche dịka mmerụaka egọ omere.